Abụ Ọma 119
Psalms 119 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta ọbụla,
ndị na-ejegharị dịka iwu Onyenwe anyị si dị. 2Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya
ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike. 3Ha adịghị eme ihe ọjọọ ọbụla;
ha na-ejegharị nʼụzọ ya niile. 4I doola ụkpụrụ
ndị a ga-erubekwara isi. 5Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na m anọgidesie ike
na-erube isi nye iwu gị niile! 6Mgbe ahụ, ihere agaghị eme m
mgbe m tulere uche nʼiwu gị niile. 7Aga m eji obi ziri ezi too gị
dịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi. 8Aga m erubere iwu gị niile isi;
biko ahapụkwala m. 9Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ?
Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị. 10Eji m obi m niile na-achọsi gị ike.
Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu. 11Ezoola m okwu gị niile nʼobi m,
igbochi m imehie imegide gị. 12Otuto dịrị gị, o Onyenwe anyị;
kuziere m iwu gị niile. 13Aga m eji egbugbere ọnụ m gụgharịa
iwu niile nke si nʼọnụ gị. 14Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niile
dịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba. 15Ana m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị
na-atulekwa uche nʼụzọ gị niile. 16Iwu gị na-amasị m;
agaghị m elefu okwu gị anya. 17Meere ohu gị ihe ọma, ka m nwe ike dị ndụ;
aga m erubere okwu gị isi. 18Kpughee anya m abụọ
ka m hụ oke ihe ebube niile dị iche iche dị nʼime okwu gị. 19Abụ m onye ọbịa nʼelu ụwa;
ezonarịla m iwu gị niile. 20Nʼoge niile, ihe banyere iwu gị niile
na-agụ mkpụrụobi m agụụ. 21Ị na-abara ndị mpako mba, ha bụ ndị a bụrụ ọnụ
na ndị na-anaghị agbaso iwu gị. 22Site nʼebe m nọ wepụ ịchị ọchị na nlelị,
nʼihi na m na-edebe ụkpụrụ gị niile. 23Nʼagbanyeghị na ndịisi nọkọrọ na-ekwulu m,
ohu gị ga-atụgharị uche nʼiwu gị. 24Ụkpụrụ gị niile bụ ihe na-amasị m;
ha bụ ndị ndụmọdụ m. 25Mkpụrụobi m na-arapara nʼuzuzu;
kpọghachite ndụ m dịka okwu gị si dị. 26Akọwaara m gị ụzọ m niile, ị zakwara m;
ugbu a, kuziere m iwu gị. 27Mee ka m ghọta ozizi ụkpụrụ gị;
ka m nwe ike tụgharịa uche nʼọrụ ebube gị niile. 28Iru ụjụ emeela ka mkpụrụobi m daa mba;
gbaa m ume dịka okwu gị si dị. 29Chebe m pụọ nʼụzọ aghụghọ niile;
site nʼiwu gị meere m amara. 30Ahọrọla m ụzọ ikwesi ntụkwasị obi;
e kpebiela m idebe obi m nʼiwu gị niile. 31O Onyenwe anyị, ana m ejigidesi iwu gị niile aka ike;
ekwela ka ihere mee m. 32Aga m agbaso iwu gị niile
nʼihi na i meela ka obi m nwere onwe ya. 33O Onyenwe anyị, zi m ụzọ m ga-esi gbasoo iwu gị niile;
mgbe ahụ, aga m edebe ha ruo nʼọgwụgwụ. 34Nye m nghọta, aga m edebe iwu gị
ma jiri obi m niile rubere ya isi. 35Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile,
nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ. 36Mee ka obi m chee ihu nʼiwu gị niile
ọ bụghị nye uru na-esite nʼọchịchọ nke onwe. 37Wepụ anya m site nʼihe na-abaghị uru;
chebe ndụ m dịka okwu gị si dị.* 38Mezuo nkwa i kwere ohu gị,
ka a tụọ egwu gị. 39Wepụ nkọcha nke m na-atụ egwu ya,
nʼihi na iwu gị niile ziri ezi. 40Ụkpụrụ gị na-agụsị m agụụ ike!
Chebe ndụ m site nʼezi omume gị. 41O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị nke na-adịgide bịakwasị m,
nzọpụta gị dịka nkwa i kwere si dị; 42mgbe ahụ, aga m azaghachi onye ahụ na-achị m ọchị,
nʼihi na ana m atụkwasị obi m nʼokwu gị. 43Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu,
nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile. 44Aga m anọgide na-erubere iwu gị isi
ruo mgbe ebighị ebi. 45Aga m ejegharị nʼọnọdụ inwere onwe
nʼihi na achọpụtala m ụkpụrụ gị niile. 46Aga m ekwupụta banyere ụkpụrụ gị nʼihu ndị eze
ma ihere agaghị eme m, 47nʼihi na iwu gị na-amasị m
nʼihi na ahụrụ m ha nʼanya. 48Ana m eweliri iwu gị niile aka elu, bụ ndị m hụrụ nʼanya,
ana m atụgharịkwa uche nʼiwu gị niile. 49Cheta okwu i nyere ohu gị,
nʼihi na i nyela m olileanya. 50Nkasiobi m nʼime ịta ahụhụ m bụ nke a:
nkwa gị na-echebe ndụ m. 51Ndị mpako na-akwa m emo na-esepụghị aka,
ma anaghị m esite nʼiwu gị wezuga onwe m. 52O Onyenwe anyị, ana m echeta iwu gị niile, ndị dị site na mgbe ochie,
ha na-ewetara m nkasiobi. 53Ana m ewe iwe nke ukwu nʼihi ndị ajọ omume,
ndị gbakụtara iwu gị azụ. 54Iwu gị niile bụ isi okwu abụ m
ebe ọbụla m na-anọ. 55Nʼabalị, o Onyenwe anyị, ana m echeta aha gị,
aga m edebekwa iwu gị. 56Nke a bụrịị ihe m na-eme oge niile:
ana m erubere ụkpụrụ gị isi. 57O Onyenwe anyị, ị bụ ihe nketa m;
ekweela m nkwa irube isi nye okwu gị niile. 58Ejirila m obi m niile chọọ ihu gị;
meere m ebere dịka nkwa gị si dị. 59Echeela m echiche banyere ụzọ m niile,
chigharịakwa na-agbaso ụkpụrụ gị niile. 60Aga m eme ngwangwa, agaghị atụfu oge
irubere iwu gị niile isi. 61A sịkwarị na ndị ajọ omume ejiri ụdọ kee m agbụ,
agaghị m echefu iwu gị. 62Nʼetiti abalị, aga m ebili nye gị ekele
nʼihi iwu gị niile ziri ezi.* 63Abụ m enyi ndị niile na-atụ egwu gị,
ndị niile na-agbaso ụkpụrụ gị. 64O Onyenwe anyị, ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya gị;
kuziere m iwu gị niile. 65Meere ohu gị ihe ọma
dịka okwu gị si dị, o Onyenwe anyị. 66Zi m ihe ọmụma na ikpe ziri ezi
nʼihi na ekwenyere m nʼiwu gị niile. 67Tupu m nwee nsogbu, a kpafuru m,
ma ugbu a, ana m erubere okwu gị isi. 68I dị mma, ihe i na-eme ziri ezi;
kuziere m iwu gị niile. 69Nʼagbanyeghị na ndị mpako a gbasaala okwu ụgha techie m,
ana m eji obi m niile na-edebe ụkpụrụ gị. 70Obi ha siri ike, ọ dịghị ihe na-emetụta ha,
ma ana m enwe mmasị nʼiwu gị. 71Ọ dị mma na m tara ahụhụ
ka m nwee ike mụta iwu gị niile. 72Iwu si nʼọnụ gị pụta dị oke ọnụahịa nye m
karịa imerime puku ọlaọcha na ọlaedo. 73Aka gị kere m, kpụọkwa m;
nye m nghọta ka m mụta iwu gị niile. 74Ka ndị na-atụ egwu gị ṅụrịa mgbe ha hụrụ m,
nʼihi na olileanya m dị nʼokwu gị. 75O Onyenwe anyị, amaara m na iwu gị niile ziri ezi,
ọ bụkwa nʼikwesị ntụkwasị obi ka ị tara m ahụhụ. 76Ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ kasịe m obi,
dịka nkwa i kwere ohu gị si dị. 77Ka ọmịiko gị bịakwasị m, ka m nwee ike dị ndụ,
nʼihi na iwu gị na-amasị m. 78Ka ihere mee ndị mpako nʼihi ihe ọjọọ ha mere m na-enweghị ihe m mere;
ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị. 79Ka ndị niile na-atụ egwu gị bịakwute m,
ndị na-aghọta ụkpụrụ gị niile. 80Ka m were obi zuruoke na-agbaso ụkpụrụ gị niile,
ka ihere ghara ime m. 81Mkpụrụobi m na-ada mba site nʼọchịchọ ya maka nzọpụta gị,
ma olileanya m dị nʼokwu gị. 82Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nkwa gị;
ana m asị, “Olee mgbe ị ga-akasị m obi?” 83Nʼagbanyeghị na adị m ka karama akpụkpọ* nke dị nʼanwụrụ ọkụ,
anaghị m echefu iwu gị niile. 84Ruo olee mgbe ka ohu gị ga-anọgide na-eche?
Olee mgbe ka ị ga-ata ndị na-akpagbu m ahụhụ? 85Ndị mpako na-egwuru m olulu,
bụ ihe nke na-adịghị ka iwu gị si dị. 86Iwu gị niile kwesiri ntụkwasị obi;
nyere m aka, nʼihi na ndị mmadụ na-akpagbu m ma o nweghị ihe m mere ha. 87Ọ fọdụrụ ntakịrị ihe, ha gaara ala m nʼiyi,
ma agbakụtaghị m ụkpụrụ gị azụ. 88Site nʼịhụnanya gị nke na-adịgide chebe ndụ m,
ka m nwe ike rube isi nʼiwu nke ọnụ gị. 89O Onyenwe anyị, okwu gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;*
ọ na-eguzosi ike nʼeluigwe. 90Ikwesi ntụkwasị obi gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ;
ọ bụ gị kere ụwa, ọ na-eguzosikwa ike. 91Ruo taa, iwu gị niile na-eguzosi ike,
nʼihi na ihe niile na-ejere gị ozi. 92A sịkwarị na iwu gị anaghị amasị m,
agaara m anwụ nʼime nsogbu m. 93Agaghị m echefu ụkpụrụ gị niile,
nʼihi na ọ bụ ha ka i ji chebe ndụ m. 94Zọpụta m, nʼihi na abụ m nke gị;
achọpụtala m ụkpụrụ gị niile. 95Ndị ajọ omume na-eche ịla m nʼiyi,
ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị. 96Ana m ahụ nsọtụ ihe niile zuruoke,
ma iwu gị niile enweghị nsọtụ. 97O, otu m si hụ iwu gị nʼanya!
Ana m atụgharị uche na ya ogologo ụbọchị niile. 98Iwu gị na-eme ka amamihe m karịa nke ndị iro m,
ha na-anọnyere m oge niile. 99Enwere m nghọta karịa ndị na-ezi m ihe,
nʼihi na ana m atụgharịa uche nʼiwu gị niile. 100Enwere m nghọta karịa ndị okenye
nʼihi na ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi. 101Ajụrụ m ajụ ije ije nʼụzọ ọjọọ ọbụla
ka m nwee ike rubere okwu gị isi 102Ewezugaghị m onwe m nʼiwu gị niile,
nʼihi na ọ bụ gị onwe gị ziri m ha. 103Lee ka okwu gị niile si atọ m ụtọ,
ha dị ụtọ nʼọnụ m karịa mmanụ aṅụ! 104A na-enweta nghọta site nʼụkpụrụ gị niile;
ya mere ana m akpọ ụzọ ọjọọ ọbụla asị. 105Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m
bụrụkwa ìhè nʼụzọ m. 106Aṅụọla m iyi, mee ka o guzosie ike,
na aga m agbaso iwu ezi omume gị niile. 107Ataala m ahụhụ nke ukwuu;
chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka okwu gị si dị. 108O Onyenwe anyị, nabata otuto afọ ofufu niile nke si nʼọnụ m,
kuziekwara m iwu gị niile. 109Mkpụrụobi m na-adị m nʼọbụaka m oge niile,
ma echezọghị m iwu gị. 110Ndị ajọ omume esielera m ọnya,
ma esitebeghị m nʼụkpụrụ gị kpafuo. 111Iwu gị niile bụ ihe nketa m ruo mgbe ebighị ebi;
ha bụ ihe na-enye obi m ọṅụ. 112Obi m ekpebiela idebe ụkpụrụ gị
ruo na ngwụcha. 113Ana m akpọ ndị na-enwe obi abụọ asị,
ma ahụrụ m iwu gị nʼanya. 114Ị bụ ebe mgbaba m na ọta m;
olileanya m dị nʼokwu gị. 115Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-eme ihe ọjọọ,
ka m nwee ike idebe iwu niile nke Chineke m! 116Gbaa m ume dịka nkwa gị si dị, aga m adịkwa ndụ;
ekwekwala ka olileanya m daa. 117Kwagide m, aga m abụ onye a gbapụtara;
aga m anọgide na-asọpụrụ iwu gị niile. 118Ị na-ajụ ndị niile na-adịghị edebe iwu gị,
nzube aghụghọ ha niile bụ ihe na-enweghị isi. 119Ị na-ekpochapụ ndị ajọ omume dịka unyi a na-ekpofu ekpofu;
nʼihi ya, ahụrụ m ụkpụrụ gị niile nʼanya. 120Anụ ahụ m na-ama jijiji nʼihi ịtụ egwu gị;
ana m eguzo nʼoke egwu nʼihi iwu gị niile. 121Emeela m ihe dị mma na ihe ziri ezi;
ahapụkwala m nʼaka ndị na-emegbu m. 122Kwee ohu gị nkwa na ị ga-elekọta ya;
ekwela ka ndị mpako kpagbuo m. 123Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nzọpụta gị
ebe m na-ele anya nkwa gị ziri ezi. 124Biko mesoo ohu gị mmeso dịka ịhụnanya gị si dị
ma kuziekwara m ụkpụrụ gị niile. 125Abụ m ohu gị, nye m nghọta,
ka m nwee ike mara ụkpụrụ gị niile. 126O Onyenwe anyị, oge eruola mgbe ị ga-arụ ọrụ,
nʼihi na a na-emebi iwu gị. 127Nʼihi na ahụrụ m iwu gị niile nʼanya
karịa ọlaedo, e karịa ọlaedo a nụchara anụcha, 128nʼihi na m na-ahụta ụkpụrụ gị niile ka ihe ziri ezi,
akpọrọ m ụzọ niile na-ezighị ezi asị. 129Iwu gị niile dị ịtụnanya;
ya mere, ana m erubere ha isi. 130Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè;
ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe. 131Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike,
na-achọsi iwu gị niile ike. 132Chee m ihu, meere m ebere,
dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere. 133Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị;
ekwela ka mmehie chịa m. 134Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m,
ka m nwee ike debe iwu gị. 135Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị.
Kuziere m ụkpụrụ gị niile. 136Anya mmiri akwa na-agba m nke ukwuu
nʼihi na ndị mmadụ adịghị erube isi nye iwu gị. 137O Onyenwe anyị, ị bụ onye ezi omume,
iwu gị niile zikwara ezi. 138Ụkpụrụ gị niile ziri ezi;
ha kwesiri ntụkwasị obi. 139Nʼihi na ndị iro m na-elefu okwu gị anya,
ịnụ ọkụ nʼobi m na-ada mba. 140Nkwa gị niile bụ ihe enyochara nke ọma,
ohu gị na-ahụkwa ha nʼanya. 141Ọ bụ ezie na m bụ onye dị ala, na onye a na-eleda anya,
ma adịghị m eleda ụkpụrụ gị niile anya. 142Ezi omume gị na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
Iwu gị niile bụkwa eziokwu. 143Nsogbu na ihe mgbu adakwasịla m,
ma iwu gị niile bụ ihe na-amasị m. 144Iwu gị niile bụ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi;
nye m nghọta, ka m nwe ike dị ndụ. 145Eji m obi m niile na-akpọ oku; zaa m o Onyenwe anyị,
aga m erubekwa isi nye ụkpụrụ gị niile. 146Ana m akpọku gị; zọpụta m
aga m erube isi nye ụkpụrụ gị niile. 147Tupu chị na-abọ, ana m ebili, na-akwa akwa maka enyemaka;
olileanya m dị nʼokwu gị. 148Ana m amụ anya abalị nʼelu ihe ndina m,
nʼihi ịtụgharị uche na nkwa gị niile. 149Nụrụ olu m dịka ịhụnanya gị si dị;
chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka iwu gị niile si dị. 150Ndị na-atụpụta atụmatụ ọjọọ nọ nso
ma ha nọ iwu gị niile nʼebe dị anya. 151Ma ị nọ nso, Onyenwe anyị;
ihe niile i nyere nʼiwu bụ eziokwu. 152Site na mgbe ochie ka m mụtara site nʼụkpụrụ gị,
na i mere ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. 153Ledata anya ka ị hụ ịta ahụhụ m ma gbapụta m,
nʼihi na echefughị m iwu gị. 154Kpepụta m, gbapụta m,
chebe ndụ m dịka nkwa gị si dị. 155Nzọpụta dị anya nʼebe ndị na-eme ihe ọjọọ nọ,
nʼihi na ha anaghị agbaso ụkpụrụ gị niile. 156O Onyenwe anyị, ọmịiko gị dị ukwuu;
chebe ndụ m dịka iwu gị niile si dị. 157Ndị iro m na ndị na-akpagbu m dị ọtụtụ,
ma aga m anọgide na-edebe iwu gị. 158Ana m asọ ndị niile na-enweghị okwukwe nʼime gị oyi,
nʼihi na ha anaghị erubere okwu gị isi. 159Lee ka m si hụ ụkpụrụ gị niile nʼanya;
chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka ịhụnanya gị si dị. 160Okwu gị niile bụ eziokwu;
iwu gị niile ziri ezi na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 161Ndịisi na-emegbu m na-enweghị ihe m mere,
ma obi m na-ama jijiji nʼihi okwu gị. 162Ana m aṅụrị ọṅụ nʼime nkwa gị
dịka onye chọtara ọtụtụ ihe nkwata nʼagha. 163Akpọrọ m okwu ụgha asị, ọ bụkwa ihe arụ nʼebe m nọ,
ma ahụrụ m iwu gị nʼanya. 164Aga m eto gị ugboro asaa nʼụbọchị,
nʼihi iwu gị ziri ezi. 165Ndị hụrụ iwu gị nʼanya nwere udo dị ukwuu,
ọ dịghị ihe ga-eme ka ha sụọ ngọngọ. 166Ana m echere nzọpụta gị, o Onyenwe anyị,
na-agbasokwa iwu gị niile. 167Ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi
nʼihi na m hụrụ ha nʼanya nke ukwuu. 168Ana m erubere ụkpụrụ na iwu gị niile isi,
nʼihi na ị maara ụzọ m niile. 169Ka akwa m ruo gị ntị, o Onyenwe anyị;
nye m nghọta dịka okwu gị si dị. 170Ka arịrịọ m ruo gị ntị;
gbapụta m dịka nkwa gị si dị. 171Ka ọnụ m jupụta nʼotuto,
nʼihi na ị na-ezi m iwu gị niile. 172Ka m jiri ire m bụọ abụ banyere okwu gị,
nʼihi na iwu gị niile ziri ezi. 173Nọọ na njikere oge niile inyere m aka,
nʼihi na ahọrọla m ụkpụrụ gị niile. 174Ana m ele anya nzọpụta gị, o Onyenwe anyị,
iwu gị bụ ihe na-amasị m. 175Kwere ka m dịrị ndụ ka m nwee ike ito gị,
ka iwu gị niile gbaa m ume. 176Akpafuola m dịka atụrụ nke furu efu,
chọọ ohu gị,
nʼihi na echefubeghị m iwu gị niile.
119:37 Mee ka m dị ndụ nʼụzọ gị
119:62 Ọrụ 16:25
119:83 Ọ bụ ihe eji agbanye mmanya, nʼelu ekwu isi nri a kwanyere ọkụ ka a na-ekonye karama akpụkpọ anụ a gbanyere mmanye ọhụrụ. Nke a bụ iji mee ka mmanya ahụ nwee ike gbaa ụka ọsịịsọ. Nʼihi na-edebere ya nʼọkụ, akpụkpọ anụ ahụ na-akpọ nku, taa ahụ, dị ochie, bụrụkwa ihe na-abaghị uru ọzọ na ihe a na-atụfu atụfu.
119:89 Aịz 40:8; Mat 24:35; 1Pt 1:25
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.