Native Bible

Psalms 119:71 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ dị mma na m tara ahụhụ ka m nwee ike mụta iwu gị niile.

Psalms 119:71 in English

Psalms 119:71 · Berean Standard Bible

It was good for me to be afflicted, that I might learn Your statutes.

Context

69Nʼagbanyeghị na ndị mpako a gbasaala okwu ụgha techie m, ana m eji obi m niile na-edebe ụkpụrụ gị. 70Obi ha siri ike, ọ dịghị ihe na-emetụta ha, ma ana m enwe mmasị nʼiwu gị. 71Ọ dị mma na m tara ahụhụ ka m nwee ike mụta iwu gị niile. 72Iwu si nʼọnụ gị pụta dị oke ọnụahịa nye m karịa imerime puku ọlaọcha na ọlaedo. 73Aka gị kere m, kpụọkwa m; nye m nghọta ka m mụta iwu gị niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.