Native Bible

Psalms 119:80 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ka m were obi zuruoke na-agbaso ụkpụrụ gị niile, ka ihere ghara ime m.

Psalms 119:80 in English

Psalms 119:80 · Berean Standard Bible

May my heart be blameless in Your statutes, that I may not be put to shame.

Context

78Ka ihere mee ndị mpako nʼihi ihe ọjọọ ha mere m na-enweghị ihe m mere; ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị. 79Ka ndị niile na-atụ egwu gị bịakwute m, ndị na-aghọta ụkpụrụ gị niile. 80Ka m were obi zuruoke na-agbaso ụkpụrụ gị niile, ka ihere ghara ime m. 81Mkpụrụobi m na-ada mba site nʼọchịchọ ya maka nzọpụta gị, ma olileanya m dị nʼokwu gị. 82Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nkwa gị; ana m asị, “Olee mgbe ị ga-akasị m obi?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.