Native Bible

Psalms 119:82 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nkwa gị; ana m asị, “Olee mgbe ị ga-akasị m obi?”

Psalms 119:82 in English

Psalms 119:82 · Berean Standard Bible

My eyes fail, looking for Your promise; I ask, “When will You comfort me?”

Context

80Ka m were obi zuruoke na-agbaso ụkpụrụ gị niile, ka ihere ghara ime m. 81Mkpụrụobi m na-ada mba site nʼọchịchọ ya maka nzọpụta gị, ma olileanya m dị nʼokwu gị. 82Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nkwa gị; ana m asị, “Olee mgbe ị ga-akasị m obi?” 83Nʼagbanyeghị na adị m ka karama akpụkpọ* nke dị nʼanwụrụ ọkụ, anaghị m echefu iwu gị niile. 84Ruo olee mgbe ka ohu gị ga-anọgide na-eche? Olee mgbe ka ị ga-ata ndị na-akpagbu m ahụhụ?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.