Native Bible

Psalms 119:83 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼagbanyeghị na adị m ka karama akpụkpọ* nke dị nʼanwụrụ ọkụ, anaghị m echefu iwu gị niile.

Psalms 119:83 in English

Psalms 119:83 · Berean Standard Bible

Though I am like a wineskin dried up by smoke, I do not forget Your statutes.

Context

81Mkpụrụobi m na-ada mba site nʼọchịchọ ya maka nzọpụta gị, ma olileanya m dị nʼokwu gị. 82Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nkwa gị; ana m asị, “Olee mgbe ị ga-akasị m obi?” 83Nʼagbanyeghị na adị m ka karama akpụkpọ* nke dị nʼanwụrụ ọkụ, anaghị m echefu iwu gị niile. 84Ruo olee mgbe ka ohu gị ga-anọgide na-eche? Olee mgbe ka ị ga-ata ndị na-akpagbu m ahụhụ? 85Ndị mpako na-egwuru m olulu, bụ ihe nke na-adịghị ka iwu gị si dị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.