Native Bible

Psalms 119:110 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị ajọ omume esielera m ọnya, ma esitebeghị m nʼụkpụrụ gị kpafuo.

Psalms 119:110 in English

Psalms 119:110 · Berean Standard Bible

The wicked have set a snare for me, but I have not strayed from Your precepts.

Context

108O Onyenwe anyị, nabata otuto afọ ofufu niile nke si nʼọnụ m, kuziekwara m iwu gị niile. 109Mkpụrụobi m na-adị m nʼọbụaka m oge niile, ma echezọghị m iwu gị. 110Ndị ajọ omume esielera m ọnya, ma esitebeghị m nʼụkpụrụ gị kpafuo. 111Iwu gị niile bụ ihe nketa m ruo mgbe ebighị ebi; ha bụ ihe na-enye obi m ọṅụ. 112Obi m ekpebiela idebe ụkpụrụ gị ruo na ngwụcha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.