Native Bible

Psalms 119:132 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Chee m ihu, meere m ebere, dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere.

Psalms 119:132 in English

Psalms 119:132 · Berean Standard Bible

Turn to me and show me mercy, as You do to those who love Your name.

Context

130Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè; ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe. 131Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike, na-achọsi iwu gị niile ike. 132Chee m ihu, meere m ebere, dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere. 133Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị; ekwela ka mmehie chịa m. 134Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m, ka m nwee ike debe iwu gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.