Native Bible

Psalms 119:104 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A na-enweta nghọta site nʼụkpụrụ gị niile; ya mere ana m akpọ ụzọ ọjọọ ọbụla asị.

Psalms 119:104 in English

Psalms 119:104 · Berean Standard Bible

I gain understanding from Your precepts; therefore I hate every false way.

Context

102Ewezugaghị m onwe m nʼiwu gị niile, nʼihi na ọ bụ gị onwe gị ziri m ha. 103Lee ka okwu gị niile si atọ m ụtọ, ha dị ụtọ nʼọnụ m karịa mmanụ aṅụ! 104A na-enweta nghọta site nʼụkpụrụ gị niile; ya mere ana m akpọ ụzọ ọjọọ ọbụla asị. 105Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m bụrụkwa ìhè nʼụzọ m. 106Aṅụọla m iyi, mee ka o guzosie ike, na aga m agbaso iwu ezi omume gị niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.