Native Bible

Psalms 120 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 120
1Ana m akpọku Onyenwe anyị nʼime nsogbu m, ọ na-azakwa m. 2O Onyenwe anyị, zọpụta m site nʼegbugbere ọnụ okwu ụgha na ire na-ekwu okwu aghụghọ. 3Gịnị ka a ga-eme gị, ọ bụkwa gịnị ọzọ ka a gatụkwasịri gị, gị ire aghụghọ? 4Ọ ga-eji àkụ dị nkọ nke dike nʼagha taa gị ahụhụ, ya na icheku ọkụ osisi brum na-ere ere. 5Ahụhụ dịịrị m nʼihi na m bi na Meshek, nʼihi na m bikwa nʼetiti ụlọ ikwu ndị Keda! 6Ogologo oge ka m binyere ndị kpọrọ udo asị. 7Abụ m onye udo; ma mgbe m kwuru okwu, okwu ha bụ okwu agha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.