Abụ Ọma 120:3
Psalms 120:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gịnị ka a ga-eme gị, ọ bụkwa gịnị ọzọ ka a gatụkwasịri gị, gị ire aghụghọ?
Psalms 120:3 in English
Psalms 120:3 · Berean Standard Bible
What will He do to you, and what will be added to you, O deceitful tongue?
Context
1Ana m akpọku Onyenwe anyị nʼime nsogbu m,
ọ na-azakwa m. 2O Onyenwe anyị, zọpụta m
site nʼegbugbere ọnụ okwu ụgha
na ire na-ekwu okwu aghụghọ. 3Gịnị ka a ga-eme gị,
ọ bụkwa gịnị ọzọ ka a gatụkwasịri gị,
gị ire aghụghọ? 4Ọ ga-eji àkụ dị nkọ nke dike nʼagha taa gị ahụhụ,
ya na icheku ọkụ osisi brum na-ere ere. 5Ahụhụ dịịrị m nʼihi na m bi na Meshek,
nʼihi na m bikwa nʼetiti ụlọ ikwu ndị Keda!
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.