Abụ Ọma 120:2
Psalms 120:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O Onyenwe anyị, zọpụta m site nʼegbugbere ọnụ okwu ụgha na ire na-ekwu okwu aghụghọ.
Psalms 120:2 in English
Psalms 120:2 · Berean Standard Bible
Deliver my soul, O LORD, from lying lips and a deceitful tongue.
Context
1Ana m akpọku Onyenwe anyị nʼime nsogbu m,
ọ na-azakwa m. 2O Onyenwe anyị, zọpụta m
site nʼegbugbere ọnụ okwu ụgha
na ire na-ekwu okwu aghụghọ. 3Gịnị ka a ga-eme gị,
ọ bụkwa gịnị ọzọ ka a gatụkwasịri gị,
gị ire aghụghọ? 4Ọ ga-eji àkụ dị nkọ nke dike nʼagha taa gị ahụhụ,
ya na icheku ọkụ osisi brum na-ere ere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.