Native Bible

Psalms 121 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 121
1Aga m eweli anya m abụọ elu, lee ha nʼelu ugwu niile, olee ebe inyeaka ga-esi bịara m? 2Inyeaka m na-esite nʼaka Onyenwe anyị,* onye kere eluigwe na ụwa bịa. 3Ọ gaghị ekwe ka ụkwụ gị gbụchapụ, onye na-eche gị nche na-amụ anya oge niile; 4nʼezie onye na-eche Izrel nche adịghị arahụ ụra, ọ dịghị atụkwa oru ụra. 5Onyenwe anyị na-eche gị nche, Onyenwe anyị bụ ndo* gị nʼaka nri gị; 6anyanwụ agaghị achagbu gị nʼehihie, ọnwa agaghị etigbukwa gị nʼabalị. 7Onyenwe anyị ga-edebe gị ka ihe ọjọọ ọbụla ghara ịdakwasị gị. Ọ ga na-eche ndụ gị nche mgbe niile. 8Onyenwe anyị ga-echebe gị mgbe ị na-apụ na mgbe ị na-abata abata, site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi. 121:2 Abụ 124:8 121:5 Aịz 25:4

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.