Abụ Ọma 122
Psalms 122 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha sị m,
“Ka anyị gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.”* 2Ụkwụ anyị eguzola ugbu a
nʼọnụ ụzọ ama gị niile, gị obodo Jerusalem. 3E wuru Jerusalem dịka obodo
a chịkọtara ọnụ nke ọma. 4Ọ bụ ebe ahụ ka ebo niile na-arịgo,
bụ ebo niile nke Onyenwe anyị,
ịbụku aha Onyenwe anyị abụ
dịka iwu o nyere ndị Izrel si dị. 5Nʼebe ahụ ka ocheeze niile nke ikpe ikpe dị,
bụ ocheeze niile nke ezinaụlọ Devid. 6Kpeenụ ekpere maka udo Jerusalem:
“Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nọọ nʼudo. 7Ka udo dịrị nʼime mgbidi gị niile
nchekwa dịrịkwa nʼime ebe nche gị niile e wusiri ike.” 8Nʼihi ụmụnne m na ndị enyi m,
ana m ekwu okwu sị, “Udo dịrị gị.” 9Nʼihi ụlọ Onyenwe anyị, Chineke anyị,
aga m achọ ọganihu gị.
122:1 Aịz 2:3; Mai 4:2; Zek 8:21
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.