Native Bible

Psalms 123 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 123
1Ana m eweli anya m abụọ elu ile gị, gị onye ocheeze ya dị nʼeluigwe. 2Dịka ohu si elekwasị nna ya ukwu anya ya, na dịka ohu nwanyị na-eje ozi si elekwasị nne ya ukwu anya, ịnata ozi ọ ga-eje,* otu a ka anyị si na-elekwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị anya, ruo mgbe ọ ga-emere anyị ebere. 3Meere anyị ebere, O Onyenwe anyị, meere anyị ebere, nʼihi na anyị abụrụla ndị a na-akọcha akọcha. 4Nʼihi na nnagide anyị na-anagide ịchị ọchị ndị nganga, na ileda anya ndị mpako adịla ukwuu. 123:2 Nʼoge ochie, ndị nwere ohu adịghị e kwuru ha okwu mgbe a na-ezi ha ozi, kama ọ bụ aka ka nne ha ukwu maọbụ nna ha ukwu ji agwa ha ihe ha kwesiri ime.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.