Abụ Ọma 123:3
Psalms 123:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Meere anyị ebere, O Onyenwe anyị, meere anyị ebere, nʼihi na anyị abụrụla ndị a na-akọcha akọcha.
Psalms 123:3 in English
Psalms 123:3 · Berean Standard Bible
Have mercy on us, O LORD, have mercy, for we have endured much contempt.
Context
1Ana m eweli anya m abụọ elu ile gị,
gị onye ocheeze ya dị nʼeluigwe. 2Dịka ohu si elekwasị nna ya ukwu anya ya,
na dịka ohu nwanyị na-eje ozi si elekwasị nne ya ukwu anya, ịnata ozi ọ ga-eje,*
otu a ka anyị si na-elekwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị anya,
ruo mgbe ọ ga-emere anyị ebere. 3Meere anyị ebere, O Onyenwe anyị, meere anyị ebere,
nʼihi na anyị abụrụla ndị a na-akọcha akọcha. 4Nʼihi na nnagide anyị na-anagide
ịchị ọchị ndị nganga,
na ileda anya ndị mpako adịla ukwuu.
123:2 Nʼoge ochie, ndị nwere ohu adịghị e kwuru ha okwu mgbe a na-ezi ha ozi, kama ọ bụ aka ka nne ha ukwu maọbụ nna ha ukwu ji agwa ha ihe ha kwesiri ime.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.