Native Bible

Psalms 124 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 124
1A sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, ka Izrel kwuo, 2a sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị, 3mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị, ha gaara eloda anyị na ndụ; 4idee mmiri gaara iri anyị, oke mmiri gaara ebufu anyị, 5ebili mmiri niile gaara ebufu anyị. 6Ma otuto dịrị Onyenwe anyị, onye na-ekweghị ka ha jiri eze ha dọrie anyị. 7Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ si gbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya; ọnya ahụ agbajiela, anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị. 8Inyeaka anyị dị nʼaha Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.