Abụ Ọma 125
Psalms 125 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Ndị niile na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọgidesi ike dị ka ugwu Zayọn
nke a na-apụghị inugharị, nke na-adịgidekwa nʼọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi. 2Dịka ugwu niile si gbaa obodo Jerusalem gburugburu,
otu a ka Onyenwe anyị na-agba ndị ya gburugburu
ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi. 3Mkpara ọchịchị ndị ajọ omume agaghị adịgide*
nʼala ndị ezi omume ketara nʼife nza,
nʼihi na ndị ezi omume nwere ike
itinye aka ha na-ime ihe ọjọọ. 4O Onyenwe anyị, meere ndị niile na-eme ezi omume ihe ọma,
ya bụ, ndị niile obi ha ziri ezi. 5Ma Onyenwe anyị ga-achụpụ ndị niile na-agbaso ụzọ aghụghọ
na ndị niile na-eme ajọ ihe.
Ka udo dịrị Izrel.
125:3 Aịz 14:5
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.