Abụ Ọma 126
Psalms 126 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Mgbe Onyenwe anyị kpọghachitere ndị e mere ka ha lọta na Zayọn,*
anyị dị ka ndị na-arọ nrọ. 2Ọchị juru anyị ọnụ,
abụ ọṅụ jukwara anyị ire.
Mgbe ahụ, e kwukwara ya na mba niile sị,
“Onyenwe anyị emeerela ha ọtụtụ ihe dị ukwuu.” 3Onyenwe anyị emeerala anyị ọtụtụ ihe dị ukwuu,
obi anyị jupụtakwara nʼọṅụ. 4Nyeghachi anyị akụnụba anyị, o Onyenwe anyị,
dịka mmiri iyi na-asọ nʼala Negev. 5Ndị niile na-eji anya mmiri na-arụ ọrụ ịkụ mkpụrụ
ga-emesịa jiri abụ ọṅụ wee ihe ubi ahụ. 6Onye ji ịkwa akwa
buru mkpụrụ ubi ọ ga-agha na-aga,
ga-emesịa jiri abụ ọṅụ na-alọghachi azụ,
mgbe ha bu ukwu ọka ha.
126:1 Jer 29:14; Jul 3:1
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.