Native Bible

Psalms 125:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mkpara ọchịchị ndị ajọ omume agaghị adịgide* nʼala ndị ezi omume ketara nʼife nza, nʼihi na ndị ezi omume nwere ike itinye aka ha na-ime ihe ọjọọ.

Psalms 125:3 in English

Psalms 125:3 · Berean Standard Bible

For the scepter of the wicked will not rest upon the land allotted to the righteous, so that the righteous will not put forth their hands to injustice.

Context

1Ndị niile na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọgidesi ike dị ka ugwu Zayọn nke a na-apụghị inugharị, nke na-adịgidekwa nʼọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi. 2Dịka ugwu niile si gbaa obodo Jerusalem gburugburu, otu a ka Onyenwe anyị na-agba ndị ya gburugburu ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi. 3Mkpara ọchịchị ndị ajọ omume agaghị adịgide* nʼala ndị ezi omume ketara nʼife nza, nʼihi na ndị ezi omume nwere ike itinye aka ha na-ime ihe ọjọọ. 4O Onyenwe anyị, meere ndị niile na-eme ezi omume ihe ọma, ya bụ, ndị niile obi ha ziri ezi. 5Ma Onyenwe anyị ga-achụpụ ndị niile na-agbaso ụzọ aghụghọ na ndị niile na-eme ajọ ihe. Ka udo dịrị Izrel. 125:3 Aịz 14:5

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.