Native Bible

Psalms 119:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile, nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ.

Psalms 119:35 in English

Psalms 119:35 · Berean Standard Bible

Direct me in the path of Your commandments, for there I find delight.

Context

33O Onyenwe anyị, zi m ụzọ m ga-esi gbasoo iwu gị niile; mgbe ahụ, aga m edebe ha ruo nʼọgwụgwụ. 34Nye m nghọta, aga m edebe iwu gị ma jiri obi m niile rubere ya isi. 35Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile, nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ. 36Mee ka obi m chee ihu nʼiwu gị niile ọ bụghị nye uru na-esite nʼọchịchọ nke onwe. 37Wepụ anya m site nʼihe na-abaghị uru; chebe ndụ m dịka okwu gị si dị.*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.