Native Bible

Psalms 119:74 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ka ndị na-atụ egwu gị ṅụrịa mgbe ha hụrụ m, nʼihi na olileanya m dị nʼokwu gị.

Psalms 119:74 in English

Psalms 119:74 · Berean Standard Bible

May those who fear You see me and rejoice, for I have hoped in Your word.

Context

72Iwu si nʼọnụ gị pụta dị oke ọnụahịa nye m karịa imerime puku ọlaọcha na ọlaedo. 73Aka gị kere m, kpụọkwa m; nye m nghọta ka m mụta iwu gị niile. 74Ka ndị na-atụ egwu gị ṅụrịa mgbe ha hụrụ m, nʼihi na olileanya m dị nʼokwu gị. 75O Onyenwe anyị, amaara m na iwu gị niile ziri ezi, ọ bụkwa nʼikwesị ntụkwasị obi ka ị tara m ahụhụ. 76Ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ kasịe m obi, dịka nkwa i kwere ohu gị si dị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.