Native Bible

Psalms 119:43 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu, nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile.

Psalms 119:43 in English

Psalms 119:43 · Berean Standard Bible

Never take Your word of truth from my mouth, for I hope in Your judgments.

Context

41O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị nke na-adịgide bịakwasị m, nzọpụta gị dịka nkwa i kwere si dị; 42mgbe ahụ, aga m azaghachi onye ahụ na-achị m ọchị, nʼihi na ana m atụkwasị obi m nʼokwu gị. 43Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu, nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile. 44Aga m anọgide na-erubere iwu gị isi ruo mgbe ebighị ebi. 45Aga m ejegharị nʼọnọdụ inwere onwe nʼihi na achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.