Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1“Ma ugbu a, Job, gee ntị nʼokwu m;
ṅaakwa ntị nke ọma nʼihe niile m ga-ekwu. 2Ejikerela m imeghe ọnụ m ikwu okwu;
okwu m dịkwa nʼọnụ ire m. 3Okwu m sitere nʼizi ezi nke obi m;
egbugbere ọnụ m na-ekwu naanị eziokwu nke m ma. 4Ọ bụ Mmụọ nke Chineke mere m,
nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye m ndụ. 5Zaghachi m ma ọ bụrụ na i nwere ike;
jikere onwe gị ka anyị rụrịtaa ụka. 6Mụ onwe m dị ka i si dị nʼihu Chineke;
mụ onwe m bụkwa ihe esitere nʼụrọ kpuo. 7Egwu m ekwesighị ime ka ị tụọ oke ụjọ,
ma ọ bụkwanụ ogwe aka m ịdị arọ nʼahụ gị. 8“Ma ị kwuola ya na ntị m,
anụrụ m okwu ndị ahụ niile, 9‘Mụ onwe m dị ọcha nʼobi m, o nweghị ihe na-ezighị ezi m mere;
adị m ọcha na-enweghị mmehie ọbụla. 10Ma Chineke chọtara ezughị oke nʼebe m nọ;
ọ na-ahụta m dịka onye iro ya. 11Ọ na-eji mkpọrọ kechie ụkwụ m abụọ;
ọ na-enyochakwa ụzọ m niile.’ 12“Ma ana m agwa gị, na nke a i meghị nke ọma,
nʼihi na Chineke dị elu karịa mmadụ. 13Gịnị mere i ji na-ekpesara ya
na ọ dịghị azaghachi mmadụ ọbụla okwu? 14Ma Chineke na-ekwu okwu, ugbu a nʼotu ụzọ, ugbu a kwa nʼụzọ ọzọ,
ọ bụ ezie na mmadụ nwere ike ghara ịghọta ya. 15Na nrọ maọbụ nʼọhụ nke abalị,
mgbe ụmụ mmadụ na-ada nʼoke ụra,
mgbe ha na-atụgharị nʼelu ihe ndina ha. 16O nwere ike kwunye ha okwu na ntị
ma mee ka egwu tụọ ha site nʼọtụtụ ịdọ aka na ntị; 17ka mmadụ si nʼajọ omume ya chegharịa,
ka o si na nganga ya wezuga onwe ya, 18ka o chebe mkpụrụobi ya site nʼolulu,
chebekwa ndụ ya site nʼịla nʼiyi nke mma agha. 19“Ọzọkwa, a na-abara mmadụ mba site nʼihe mgbu nke na-eme ka o dinara nʼelu ihe ndina,
ebe ọkpụkpọ niile dị ya nʼahụ na-anọgide na-egbu ya mgbu. 20Nke na-eme ka ndụ ya na-asọ ihe oriri oyi,
ọzọ, mkpụrụobi ya na-ajụkwa nri dịkarịsịrị ụtọ. 21Anụ ahụ ya na-abụ ihe na-ala nʼiyi,
ma ọkpụkpụ ya; nke bụ ihe zoro ezo na mbụ, na-apụta ihe ugbu a. 22Mkpụrụobi ya na-abịaru ili nso,
ndụ ha na-anọkwa nso nʼaka ndị na-ejere ọnwụ ozi. 23Ma a sị na e nwere mmụọ ozi nọ ya nʼakụkụ,
dịka onye nkwuchite ọnụ, otu onye nʼetiti puku mmadụ,
onye ga-agwa mmadụ ihe ziri ezi nye ya, 24ọ na-emere onye ahụ amara, na-asịkwa Chineke,
‘Napụta ya, ekwela ka ọ gbadaa nʼime olulu ili;
achọtala ihe mgbapụta nʼihi ya. 25Ka ahụ ya nwogharịa dịka nke nwantakịrị,
ka a eweghachi ike ya dịka ọ dị nʼụbọchị okorobịa ya.’ 26Mgbe ahụ, onye ahụ ga-arịọ Chineke arịrịọ ma chọtakwa ihuọma ya,
ha ga-ahụ ihu Chineke ma tiekwa mkpu ọṅụ,
ọ na-enyeghachi ha ezi ihe nʼihi ezi omume ya. 27Mgbe ahụ, ọ na-abịakwute ụmụ mmadụ sị ha:
‘Emehiere m, mee ihe ziri ezi ka ọ bụrụ ajọ omume,
ma anataghị m ihe kwesiri ịbụ ụgwọ ọrụ m; 28ọ gbapụtara mkpụrụobi m ka m ghara ịrịda nʼolulu ili,
ya mere aga m adị ndụ hụkwa ìhè nke ndụ.’ 29“Ihe ndị a niile ka Chineke na-emere mmadụ
ugboro abụọ, ọbụladị ugboro atọ. 30Ka ọ dọghachite mkpụrụobi ya site nʼolulu ili,
ka ìhè nke ndụ si otu a mụkwasị ya. 31“Gee ntị, Job, ma nụrụ okwu m;
dere jii ka m kwuo okwu. 32Ọ bụrụ na i nwere ihe ị chọrọ ikwu, zaghachi m;
kwupụ okwu, nʼihi na achọrọ m ịgụ gị nʼonye ezi omume. 33Ma ọ bụghị otu a, gee m ntị;
dere jii, ka m zi gị amamihe.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.