Job 33:27
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ọ na-abịakwute ụmụ mmadụ sị ha: ‘Emehiere m, mee ihe ziri ezi ka ọ bụrụ ajọ omume, ma anataghị m ihe kwesiri ịbụ ụgwọ ọrụ m;
Job 33:27 in English
Job 33:27 · Berean Standard Bible
Then he sings before * men with these words: ‘I have sinned and perverted what was right; yet I did not get what I deserved.
Context
25Ka ahụ ya nwogharịa dịka nke nwantakịrị,
ka a eweghachi ike ya dịka ọ dị nʼụbọchị okorobịa ya.’ 26Mgbe ahụ, onye ahụ ga-arịọ Chineke arịrịọ ma chọtakwa ihuọma ya,
ha ga-ahụ ihu Chineke ma tiekwa mkpu ọṅụ,
ọ na-enyeghachi ha ezi ihe nʼihi ezi omume ya. 27Mgbe ahụ, ọ na-abịakwute ụmụ mmadụ sị ha:
‘Emehiere m, mee ihe ziri ezi ka ọ bụrụ ajọ omume,
ma anataghị m ihe kwesiri ịbụ ụgwọ ọrụ m; 28ọ gbapụtara mkpụrụobi m ka m ghara ịrịda nʼolulu ili,
ya mere aga m adị ndụ hụkwa ìhè nke ndụ.’ 29“Ihe ndị a niile ka Chineke na-emere mmadụ
ugboro abụọ, ọbụladị ugboro atọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.