Job 33:28
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ọ gbapụtara mkpụrụobi m ka m ghara ịrịda nʼolulu ili, ya mere aga m adị ndụ hụkwa ìhè nke ndụ.’
Job 33:28 in English
Job 33:28 · Berean Standard Bible
He redeemed my soul from going down to the Pit, and I will live to see the light.’
Context
26Mgbe ahụ, onye ahụ ga-arịọ Chineke arịrịọ ma chọtakwa ihuọma ya,
ha ga-ahụ ihu Chineke ma tiekwa mkpu ọṅụ,
ọ na-enyeghachi ha ezi ihe nʼihi ezi omume ya. 27Mgbe ahụ, ọ na-abịakwute ụmụ mmadụ sị ha:
‘Emehiere m, mee ihe ziri ezi ka ọ bụrụ ajọ omume,
ma anataghị m ihe kwesiri ịbụ ụgwọ ọrụ m; 28ọ gbapụtara mkpụrụobi m ka m ghara ịrịda nʼolulu ili,
ya mere aga m adị ndụ hụkwa ìhè nke ndụ.’ 29“Ihe ndị a niile ka Chineke na-emere mmadụ
ugboro abụọ, ọbụladị ugboro atọ. 30Ka ọ dọghachite mkpụrụobi ya site nʼolulu ili,
ka ìhè nke ndụ si otu a mụkwasị ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.