Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Job 32
1Mgbe ahụ, ndị ikom atọ ndị a kwusịrị ịsa Job okwu ọbụla ọzọ nʼihi na ọ hụrụ onwe ya dịka onye ezi omume. 2Ma oke iwe were Elihu nwa Barakel onye obodo Buz, si nʼikwu Ram megide Job nʼihi na ọ gụrụ onwe ya dịka onye ezi omume karịa Chineke. 3Iwe wekwara ya nʼebe mmadụ atọ ndị enyi Job nọ, nʼihi na ọ dịghị ebe ha hụtara Job dịka onye ụzọ ya na-ezighị ezi, ma ha gara nʼihu ịma ya ikpe. 4Ma ruo ugbu a, Elihu agwaghị Job okwu ọbụla nʼihi na ndị ọzọ bụ okenye nʼebe ọ nọ. 5Ma mgbe ọ hụrụ na ndị ikom atọ ndị a enweghị okwu ọzọ ha ga-ekwu, nke a kpasuru ya iwe. 6Ma Elihu nwa Barakel onye obodo Buz zara sị: “Abụ m nwantakịrị nʼọnụọgụgụ afọ m gbara, ma unu bụ ndị okenye; ọ bụ nke a mere m ji gbaa nkịtị nʼụjọ, hapụ ịgwa unu ihe m maara. 7Echere m nʼobi m sị, ‘Ọnụọgụgụ afọ ga-ekwu okwu; ọtụtụ afọ ka ọ dịkwara ikuzi amamihe.’ 8Ma ọ bụ mmụọ dị nʼime mmadụ, nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye nghọta. 9Ọ bụghị naanị ndị okenye bụ ndị mara ihe, ọ bụkwaghị naanị ndị gbara ọtụtụ afọ bụ ndị na-aghọta ihe ziri ezi. 10“Ya mere m na-asị, Geenụ m ntị; mụ onwe m ga-agwa unu ihe m ma. 11Echeere m oge niile unu na-ekwu okwu, egere m ntị na ntụgharị uche unu, oge niile unu na-achọpụta okwu unu ga-ekwu. 12Egere m nnọọ unu ntị, ma ọ dịghị onye nʼime unu nwerela ike gosi Job ụzọ o si jehie; ọ dịghị onye nʼime unu zaghachiri ịrụ ụka ya. 13Unu ekwula sị, ‘Anyị achọtala amamihe; ka Chineke na-abụghị mmadụ gosi ya mmehie ya.’ 14Ma Job edozighị okwu ya nʼusoro megide m, ya mere agaghị m eji ịrụ ụka unu zaghachi ya. 15“Ha adaala mba na-enweghị ihe ọzọ ha ga-ekwu; ike okwu agwụla ha. 16M ga-echere, ugbu a ha deere duu, ugbu a ha guzo ebe ahụ na-enweghị ọsịsa? 17Mụ onwe m ga-ekwu uche m; ihe m maara ka mụ onwe m ga-ekwu, 18nʼihi na okwu juru m ọnụ, ọ bụkwa mmụọ dị nʼime m na-akwagide m. 19Nʼime m, adị m ka mmanya na-agbọ ụfụfụ a kwuchiri na karama, dịka karama akpụkpọ ọhụrụ dị njikere ịgbawa. 20Aga m ekwurịrị okwu ka m sị nʼụzọ dị otu a chọta izuike; aga m emeghe egbugbere ọnụ m ma zaghachi. 21Agaghị m ekpe mmadụ ọbụla ikpe mmegide maọbụ jaa mmadụ ọbụla mma nʼụzọ na-ezighị ezi. 22Nʼihi na ọ bụrụ na m bụ ọka nwere ire ụtọ nʼịja ihe na-ezighị ezi mma, Onye kere m ga-ewepụ m nʼoge na-adịghị anya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.