Job 32:14
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Job edozighị okwu ya nʼusoro megide m, ya mere agaghị m eji ịrụ ụka unu zaghachi ya.
Job 32:14 in English
Job 32:14 · Berean Standard Bible
But Job has not directed his words against me, and I will not answer him with your arguments.
Context
12Egere m nnọọ unu ntị,
ma ọ dịghị onye nʼime unu nwerela ike gosi Job ụzọ o si jehie;
ọ dịghị onye nʼime unu zaghachiri ịrụ ụka ya. 13Unu ekwula sị, ‘Anyị achọtala amamihe;
ka Chineke na-abụghị mmadụ gosi ya mmehie ya.’ 14Ma Job edozighị okwu ya nʼusoro megide m,
ya mere agaghị m eji ịrụ ụka unu zaghachi ya. 15“Ha adaala mba na-enweghị ihe ọzọ ha ga-ekwu;
ike okwu agwụla ha. 16M ga-echere, ugbu a ha deere duu,
ugbu a ha guzo ebe ahụ na-enweghị ọsịsa?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.