Job 32:8
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ bụ mmụọ dị nʼime mmadụ, nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye nghọta.
Job 32:8 in English
Job 32:8 · Berean Standard Bible
But there is a spirit * in a man, the breath of the Almighty, that gives him understanding.
Context
6Ma Elihu nwa Barakel onye obodo Buz zara sị:
“Abụ m nwantakịrị nʼọnụọgụgụ afọ m gbara,
ma unu bụ ndị okenye;
ọ bụ nke a mere m ji gbaa nkịtị nʼụjọ,
hapụ ịgwa unu ihe m maara. 7Echere m nʼobi m sị, ‘Ọnụọgụgụ afọ ga-ekwu okwu;
ọtụtụ afọ ka ọ dịkwara ikuzi amamihe.’ 8Ma ọ bụ mmụọ dị nʼime mmadụ,
nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye nghọta. 9Ọ bụghị naanị ndị okenye bụ ndị mara ihe,
ọ bụkwaghị naanị ndị gbara ọtụtụ afọ bụ ndị na-aghọta ihe ziri ezi. 10“Ya mere m na-asị, Geenụ m ntị;
mụ onwe m ga-agwa unu ihe m ma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.