Job 32:10
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ya mere m na-asị, Geenụ m ntị; mụ onwe m ga-agwa unu ihe m ma.
Job 32:10 in English
Job 32:10 · Berean Standard Bible
Therefore I say, ‘Listen to me; I too will declare what I know.’
Context
8Ma ọ bụ mmụọ dị nʼime mmadụ,
nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye nghọta. 9Ọ bụghị naanị ndị okenye bụ ndị mara ihe,
ọ bụkwaghị naanị ndị gbara ọtụtụ afọ bụ ndị na-aghọta ihe ziri ezi. 10“Ya mere m na-asị, Geenụ m ntị;
mụ onwe m ga-agwa unu ihe m ma. 11Echeere m oge niile unu na-ekwu okwu,
egere m ntị na ntụgharị uche unu,
oge niile unu na-achọpụta okwu unu ga-ekwu. 12Egere m nnọọ unu ntị,
ma ọ dịghị onye nʼime unu nwerela ike gosi Job ụzọ o si jehie;
ọ dịghị onye nʼime unu zaghachiri ịrụ ụka ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.