Job 32:11
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Echeere m oge niile unu na-ekwu okwu, egere m ntị na ntụgharị uche unu, oge niile unu na-achọpụta okwu unu ga-ekwu.
Job 32:11 in English
Job 32:11 · Berean Standard Bible
Indeed, I waited while you spoke; I listened to your reasoning; as you searched for words,
Context
9Ọ bụghị naanị ndị okenye bụ ndị mara ihe,
ọ bụkwaghị naanị ndị gbara ọtụtụ afọ bụ ndị na-aghọta ihe ziri ezi. 10“Ya mere m na-asị, Geenụ m ntị;
mụ onwe m ga-agwa unu ihe m ma. 11Echeere m oge niile unu na-ekwu okwu,
egere m ntị na ntụgharị uche unu,
oge niile unu na-achọpụta okwu unu ga-ekwu. 12Egere m nnọọ unu ntị,
ma ọ dịghị onye nʼime unu nwerela ike gosi Job ụzọ o si jehie;
ọ dịghị onye nʼime unu zaghachiri ịrụ ụka ya. 13Unu ekwula sị, ‘Anyị achọtala amamihe;
ka Chineke na-abụghị mmadụ gosi ya mmehie ya.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.