Job 32:7
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Echere m nʼobi m sị, ‘Ọnụọgụgụ afọ ga-ekwu okwu; ọtụtụ afọ ka ọ dịkwara ikuzi amamihe.’
Job 32:7 in English
Job 32:7 · Berean Standard Bible
I thought that age should speak, and many years should teach wisdom.
Context
5Ma mgbe ọ hụrụ na ndị ikom atọ ndị a enweghị okwu ọzọ ha ga-ekwu, nke a kpasuru ya iwe. 6Ma Elihu nwa Barakel onye obodo Buz zara sị:
“Abụ m nwantakịrị nʼọnụọgụgụ afọ m gbara,
ma unu bụ ndị okenye;
ọ bụ nke a mere m ji gbaa nkịtị nʼụjọ,
hapụ ịgwa unu ihe m maara. 7Echere m nʼobi m sị, ‘Ọnụọgụgụ afọ ga-ekwu okwu;
ọtụtụ afọ ka ọ dịkwara ikuzi amamihe.’ 8Ma ọ bụ mmụọ dị nʼime mmadụ,
nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye nghọta. 9Ọ bụghị naanị ndị okenye bụ ndị mara ihe,
ọ bụkwaghị naanị ndị gbara ọtụtụ afọ bụ ndị na-aghọta ihe ziri ezi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.