Job 32:21
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Agaghị m ekpe mmadụ ọbụla ikpe mmegide maọbụ jaa mmadụ ọbụla mma nʼụzọ na-ezighị ezi.
Job 32:21 in English
Job 32:21 · Berean Standard Bible
I will be partial to no one, nor will I flatter any man.
Context
19Nʼime m, adị m ka mmanya na-agbọ ụfụfụ a kwuchiri na karama,
dịka karama akpụkpọ ọhụrụ dị njikere ịgbawa. 20Aga m ekwurịrị okwu ka m sị nʼụzọ dị otu a chọta izuike;
aga m emeghe egbugbere ọnụ m ma zaghachi. 21Agaghị m ekpe mmadụ ọbụla ikpe mmegide
maọbụ jaa mmadụ ọbụla mma nʼụzọ na-ezighị ezi. 22Nʼihi na ọ bụrụ na m bụ ọka nwere ire ụtọ nʼịja ihe na-ezighị ezi mma,
Onye kere m ga-ewepụ m nʼoge na-adịghị anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.