Job 32:19
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼime m, adị m ka mmanya na-agbọ ụfụfụ a kwuchiri na karama, dịka karama akpụkpọ ọhụrụ dị njikere ịgbawa.
Job 32:19 in English
Job 32:19 · Berean Standard Bible
Behold, my belly is like unvented wine; it is about to burst like a new wineskin.
Context
17Mụ onwe m ga-ekwu uche m;
ihe m maara ka mụ onwe m ga-ekwu, 18nʼihi na okwu juru m ọnụ,
ọ bụkwa mmụọ dị nʼime m na-akwagide m. 19Nʼime m, adị m ka mmanya na-agbọ ụfụfụ a kwuchiri na karama,
dịka karama akpụkpọ ọhụrụ dị njikere ịgbawa. 20Aga m ekwurịrị okwu ka m sị nʼụzọ dị otu a chọta izuike;
aga m emeghe egbugbere ọnụ m ma zaghachi. 21Agaghị m ekpe mmadụ ọbụla ikpe mmegide
maọbụ jaa mmadụ ọbụla mma nʼụzọ na-ezighị ezi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.