Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1“Mụ na anya m gbara ndụ kpebie
na o nweghị mgbe m ga-ele nwaagbọghọ ọbụla anya nʼihi agụụ ịkwa iko.* 2Nʼihi na, gịnị bụ oke mmadụ ketara nʼaka Chineke onye bi nʼelu;
gịnị bụkwa ihe nketa ya site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile nọ nʼelu? 3Ọ bụghị mbibi nye ndị ajọ omume,
nhụju anya nye ndị na-eme ihe ọjọọ? 4Ọ bụ na ọ naghị ahụ ụzọ m niile,
gụọkwa nzọ ukwu m niile ọnụ? 5“Ọ bụrụ na m gara ije nʼụzọ ụgha
maọbụ na ụkwụ m mere ngwangwa gbasoro ụzọ aghụghọ, 6ka Chineke were ihe ọtụtụ ziri ezi tụọ m,
ọ ga-amata na m bụ onye na-enweghị ịta ụta. 7Ọ bụrụ na nzọ ụkwụ m si nʼụzọ wezuga onwe ya,
ọ bụrụ anya m na-edu obi m,
ma ọ bụkwanụ na aka m abụọ bụ ihe e merụrụ emerụ, 8ọ bụrụ otu a, ka onye ọzọ rie ihe m kụrụ nʼubi,
ka e hopuchakwa ihe niile m kụrụ nʼubi. 9“Ọ bụrụ na ọ gụọla obi m agụụ ijekwuru nwanyị ọzọ,
maọbụ na m ezoola nʼọnụ ụzọ onye agbataobi m, 10mgbe ahụ, ka nwunye m kwọọrọ nwoke ọzọ nri,
ka ndị ikom ọzọ dinaa ya. 11Nʼihi na nke ahụ ga-abụ ihe ihere,
bụrụkwa mmehie kwesiri ka e kpee ya ikpe. 12Ọ bụ ọkụ na-ere ruo nʼebe ịla nʼiyi;*
nke pụrụ ihopu ihe owuwe ubi m niile. 13“Ọ bụrụ na m jụrụ ikpe ikpe ziri ezi
nye nwoke maọbụ nwanyị ọbụla na-ejere m ozi
mgbe ha nwere mkpesa megide m, 14gịnị ka m ga-eme mgbe Chineke bịakwutere m?
Gịnị ka m ga-aza ya mgbe ọ jụrụ m ajụjụ? 15Ọ bụ na ọ bụghị onye kpụrụ m nʼafọ nne m mekwara ha?
Ọ bụghị ya kpụrụ anyị abụọ nʼafọ nne anyị? 16“Ọ bụrụ na m ajụ inye ndị ogbenye ihe dị ha mkpa,
ma ọ bụrụkwa na m eme ka anya nwanyị di ya nwụrụ dalaa ya nʼisi, 17ọ bụrụ na m dobere ihe oriri m maka naanị m,
ma jụ inye ya ụmụ mgbei; 18ma site nʼokorobịa m, azụlitere m ha dịka nna kwesiri,
ọ bụkwa site na nwantakịrị ka m bụ onyendu nye nwanyị di ya nwụrụ. 19Ọ bụrụ na ọ dị mgbe m hụrụ onye na-ala nʼiyi nʼihi enweghị akwa,
maọbụ onye nọ nʼụkọ nke na-enweghị uwe, 20ma obi ha agọzighị m
nʼihi iji ajị sitere nʼụmụ atụrụ m mee ka o nwee okpomọkụ nʼahụ ya. 21Ọ bụrụ na m eweliela aka m megide onye nna ya nwụrụ,
nʼihi na m mara na m nwere nkwuwa okwu nʼụlọikpe, 22mgbe ahụ, ka aka m si nʼubu m dapụ,
ka e tijiekwa ogwe aka m site na nkwonkwo ya. 23Nʼihi na atụrụ m egwu mbibi na-esite nʼaka Chineke,
nʼihi egwu ebube ya, enweghị m ike ime ihe ndị a. 24“Ọ bụrụ na ntụkwasị obi m dị nʼọlaedo,
maọbụ na m sị ọlaedo a nụchara anụcha, ‘Ị bụ ebe ndabere m.’ 25Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi oke akụ m,
ihe nnweta nke aka m ritere nʼuru, 26ọ bụrụ na m legidere anyanwụ anya nʼebube ya,
maọbụ ọnwa nʼike nchawa ya, 27nke ga-eme ka obi m bụrụ ihe a rafuru na nzuzo,
maọbụ aka m abụrụ ihe e weliri ife ha ofufe, 28mgbe ahụ, ihe ndị a ga-abụ mmehie nke a ga-ekpe ikpe,
nʼihi na m gaara abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke, Onye bi nʼelu. 29“Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọdachi nke dakwasịrị onye iro m
maọbụ chịa ọchị nʼihi nsogbu nke dakwasịrị ya, 30ekwebeghị m ka ọnụ m mehie
megide ha site nʼịbụ ndụ ha ọnụ. 31Ọ bụrụ na o nwebeghị oge ndị nọ nʼezinaụlọ m kwuru okwu sị.
‘Onye ka ọ bụ nke na-erijubeghị afọ site nʼihe oriri Job na-enye?’ 32Ma ọ dịghị onye ọbịa na-anọ ọnọdụ abalị nʼama,
nʼihi ụzọ m na-eghe oghe mgbe ọbụla nye ndị ije. 33Ọ bụrụ na m na-ezo mmehie m dịka ndị ọzọ,*
site nʼizobe mmehie m nʼime obi m, 34nʼihi na m tụrụ egwu igwe mmadụ,
si otu a, tụọ oke egwu nʼihi nleda anya nke ndị agbụrụ dị iche iche,
nke mere ka m gbaa nkịtị ghara ịpụ nʼezi. 35(“O, a sị na o nwere onye ga-ege m ntị!
Ana m ebinye aka m nʼokwu ngọpụ m, ka Onye pụrụ ime ihe niile za m,
ka onye na-ebo m ebubo depụta ihe o nwere megide m nʼakwụkwọ. 36Nʼezie, aga m eyiri ya nʼubu m,
aga m eyinyekwa ya dịka okpueze. 37Aga m agụkọrọ ya nzọ ụkwụ m niile,
aga m ejekwuru ya dịka ọkpara eze.) 38“Ọ bụrụ na ala m etie mkpu megide m,
ọ bụrụ na olulu dị na ya ejupụta nʼanya mmiri, 39ọ bụrụ na m eripịa ihe o mepụtara na-akwụghị ụgwọ,
maọbụ mee ka mmụọ ndị bi nʼime ya daa mba, 40ka ogwu pupụta nʼọnọdụ ọka wiiti,
ka ahịhịa na-esi isi ọjọọ pupụtakwa nʼọnọdụ ọka balị.”
Okwu Job agwụla.
31:1 Maọbụ, anya ọjọọ Mat 5:28
31:12 Maọbụ, Mbibi
31:33 Maọbụ, dịka Adam mere
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.