Job 31:35
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
(“O, a sị na o nwere onye ga-ege m ntị! Ana m ebinye aka m nʼokwu ngọpụ m, ka Onye pụrụ ime ihe niile za m, ka onye na-ebo m ebubo depụta ihe o nwere megide m nʼakwụkwọ.
Job 31:35 in English
Job 31:35 · Berean Standard Bible
(Oh, that I had one to hear me! Here is my signature. Let the Almighty answer me; let my accuser compose an indictment.
Context
33Ọ bụrụ na m na-ezo mmehie m dịka ndị ọzọ,*
site nʼizobe mmehie m nʼime obi m, 34nʼihi na m tụrụ egwu igwe mmadụ,
si otu a, tụọ oke egwu nʼihi nleda anya nke ndị agbụrụ dị iche iche,
nke mere ka m gbaa nkịtị ghara ịpụ nʼezi. 35(“O, a sị na o nwere onye ga-ege m ntị!
Ana m ebinye aka m nʼokwu ngọpụ m, ka Onye pụrụ ime ihe niile za m,
ka onye na-ebo m ebubo depụta ihe o nwere megide m nʼakwụkwọ. 36Nʼezie, aga m eyiri ya nʼubu m,
aga m eyinyekwa ya dịka okpueze. 37Aga m agụkọrọ ya nzọ ụkwụ m niile,
aga m ejekwuru ya dịka ọkpara eze.)
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.