Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

(“O, a sị na o nwere onye ga-ege m ntị! Ana m ebinye aka m nʼokwu ngọpụ m, ka Onye pụrụ ime ihe niile za m, ka onye na-ebo m ebubo depụta ihe o nwere megide m nʼakwụkwọ.

Job 31:35 in English

Job 31:35 · Berean Standard Bible

(Oh, that I had one to hear me! Here is my signature. Let the Almighty answer me; let my accuser compose an indictment.

Context

33Ọ bụrụ na m na-ezo mmehie m dịka ndị ọzọ,* site nʼizobe mmehie m nʼime obi m, 34nʼihi na m tụrụ egwu igwe mmadụ, si otu a, tụọ oke egwu nʼihi nleda anya nke ndị agbụrụ dị iche iche, nke mere ka m gbaa nkịtị ghara ịpụ nʼezi. 35(“O, a sị na o nwere onye ga-ege m ntị! Ana m ebinye aka m nʼokwu ngọpụ m, ka Onye pụrụ ime ihe niile za m, ka onye na-ebo m ebubo depụta ihe o nwere megide m nʼakwụkwọ. 36Nʼezie, aga m eyiri ya nʼubu m, aga m eyinyekwa ya dịka okpueze. 37Aga m agụkọrọ ya nzọ ụkwụ m niile, aga m ejekwuru ya dịka ọkpara eze.)

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.