Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na m na-ezo mmehie m dịka ndị ọzọ,* site nʼizobe mmehie m nʼime obi m,

Job 31:33 in English

Job 31:33 · Berean Standard Bible

if I have covered my transgressions like Adam * by hiding my guilt in my heart,

Context

31Ọ bụrụ na o nwebeghị oge ndị nọ nʼezinaụlọ m kwuru okwu sị. ‘Onye ka ọ bụ nke na-erijubeghị afọ site nʼihe oriri Job na-enye?’ 32Ma ọ dịghị onye ọbịa na-anọ ọnọdụ abalị nʼama, nʼihi ụzọ m na-eghe oghe mgbe ọbụla nye ndị ije. 33Ọ bụrụ na m na-ezo mmehie m dịka ndị ọzọ,* site nʼizobe mmehie m nʼime obi m, 34nʼihi na m tụrụ egwu igwe mmadụ, si otu a, tụọ oke egwu nʼihi nleda anya nke ndị agbụrụ dị iche iche, nke mere ka m gbaa nkịtị ghara ịpụ nʼezi. 35(“O, a sị na o nwere onye ga-ege m ntị! Ana m ebinye aka m nʼokwu ngọpụ m, ka Onye pụrụ ime ihe niile za m, ka onye na-ebo m ebubo depụta ihe o nwere megide m nʼakwụkwọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.