Job 31:17
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ọ bụrụ na m dobere ihe oriri m maka naanị m, ma jụ inye ya ụmụ mgbei;
Job 31:17 in English
Job 31:17 · Berean Standard Bible
if I have eaten my morsel alone, not sharing it with the fatherless—
Context
15Ọ bụ na ọ bụghị onye kpụrụ m nʼafọ nne m mekwara ha?
Ọ bụghị ya kpụrụ anyị abụọ nʼafọ nne anyị? 16“Ọ bụrụ na m ajụ inye ndị ogbenye ihe dị ha mkpa,
ma ọ bụrụkwa na m eme ka anya nwanyị di ya nwụrụ dalaa ya nʼisi, 17ọ bụrụ na m dobere ihe oriri m maka naanị m,
ma jụ inye ya ụmụ mgbei; 18ma site nʼokorobịa m, azụlitere m ha dịka nna kwesiri,
ọ bụkwa site na nwantakịrị ka m bụ onyendu nye nwanyị di ya nwụrụ. 19Ọ bụrụ na ọ dị mgbe m hụrụ onye na-ala nʼiyi nʼihi enweghị akwa,
maọbụ onye nọ nʼụkọ nke na-enweghị uwe,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.