Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọdachi nke dakwasịrị onye iro m maọbụ chịa ọchị nʼihi nsogbu nke dakwasịrị ya,

Job 31:29 in English

Job 31:29 · Berean Standard Bible

If I have rejoiced in my enemy’s ruin, or exulted when evil befell him—

Context

27nke ga-eme ka obi m bụrụ ihe a rafuru na nzuzo, maọbụ aka m abụrụ ihe e weliri ife ha ofufe, 28mgbe ahụ, ihe ndị a ga-abụ mmehie nke a ga-ekpe ikpe, nʼihi na m gaara abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke, Onye bi nʼelu. 29“Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọdachi nke dakwasịrị onye iro m maọbụ chịa ọchị nʼihi nsogbu nke dakwasịrị ya, 30ekwebeghị m ka ọnụ m mehie megide ha site nʼịbụ ndụ ha ọnụ. 31Ọ bụrụ na o nwebeghị oge ndị nọ nʼezinaụlọ m kwuru okwu sị. ‘Onye ka ọ bụ nke na-erijubeghị afọ site nʼihe oriri Job na-enye?’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.