Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1“Ma ugbu a, ha na-akwa m emo
bụ ndị bụ ụmụntakịrị nʼebe m nọ,
bụ ndị nna ha na-etorughị ndị m na-ezipụ
ka ha na nkịta na-eso atụrụ m nọkọta. 2Uru gịnị ka ike aka ha ga-abara m,
ebe ọ bụ na ha adịghịkwa ike? 3Ha bụ ndị ike gwụrụ site nʼụkọ na agụụ,
ha na-agagharị nʼala kpọrọ nkụ
na-awagharịkwa nʼime ọzara nʼabalị. 4Nʼala ọhịa ka ha na-atụrị ahịhịa nnu,
mgbọrọgwụ osisi brum bụkwa nri ha. 5A chụpụrụ ha site nʼetiti ndị mmadụ ibe ha,
a na-etiso ha mkpu dịka ha bụ ndị ohi. 6A chụpụrụ ha ka ha gaa biri nʼala iyi mmiri na-adịghị.
Ha bi nʼetiti ọgba nkume na ọnụ a tụrụ nʼime ala. 7Ha na-eme ụzụ nʼọhịa dịka ụmụ anụmanụ,
na-ejikọta onwe ha nʼahịhịa toro nʼokpuru osisi. 8Ha bụ ndị e ledara anya, ndị na-enweghị aha,
e sitere nʼala ahụ chụpụ ha. 9“Ma ugbu a, abụrụla m ihe ụmụ okorobịa ji abụ abụ ịkwa emo;
abụrụkwala m okwu ha ji anọpụrụ ụbọchị. 10Abụ m ihe ịsọ oyi nye ha, ha adịghị abịakwa m nso;
ha anaghị egbu oge igbu m asọ mmiri nʼihu. 11Ma ugbu a, ebe ọ bụ na Chineke atọpụla eriri ụta m ma kpagbuo m,
o nwekwaghị ihe ha na-adịghị eme nʼihu m. 12Nʼaka nri m mba ndị a na-ebuso m agha.
Ha na-esiri ụkwụ m ọnya,
ha na-ewuli mgbidi ha nọchibido m. 13Ha na-etiwasị ụzọ m,
ha kwadoro mmekpa ahụ m.
‘O nweghị onye ga-enyere ya aka,’ ka ha na-ekwu. 14Ha na-abịakwasị m dịka ndị sitere ebe e tipuru mgbidi;
nʼetiti mbibi ya ha na-enu onwe ha enute nʼebe m nọ. 15Oke egwu abịakwasịla m;
ugwu m adịla ka ihe ifufe buuru,
nchekwa m agabigala dịka igwe ojii. 16“Ugbu a, ndụ m ji nwayọọ nwayọọ na-agabiga;
ụbọchị ahụhụ ejidela m. 17Abalị na-esewasị ọkpụkpụ m,
ihe mgbu m nke na-ata ata enweghị ezumike. 18Nʼoke ike ya, Chineke na-adịrị m ka uwe;
ọ na-ekechi m dịka olu uwe m. 19Ọ na-atụba m nʼime apịtị,
mee ka m ghọọ ntụ na aja. 20“Chineke m, anam etiku gị ma ị dịghị aza m;
anam eguzo ọtọ, ma naanị anya ka i lere m. 21Ị na-emegide m na-enweghị obi ebere;
i ji aka gị dị ike megide m. 22Ị na-ejide m nʼike welie m elu chụba m nʼoke ifufe,
ị na-eme ka m bụrụ onye na-akwụfegharị nʼoke ifufe nke mmiri. 23Amara m na ị ga-eweda m ruo ọnwụ;
ruo nʼebe e debeere mmadụ niile dị ndụ. 24“Nʼezie, ọ dịghị onye na-emegide onye e tidara nʼala;
mgbe ọ na-eti mkpu nʼọnọdụ nhụju anya ya na-achọ enyemaka. 25Ọ bụ na m akwaghị akwa nʼihi ndị nọ na nsogbu;
ọ bụ na mmụọ m erughị ụjụ nʼihi ndị ogbenye? 26Ma mgbe m lere anya ihe ọma, ihe ọjọọ bịara;
mgbe m lere anya ìhè, mgbe ahụ ka ọchịchịrị bịara. 27Obi m anaghị ezu ike nʼime m;
ụbọchị ahụhụ na-ezute m. 28Ana m agagharị na-eji nji ma ọ bụghị nʼihi oke anwụ.
Eguzola m ọtọ nʼọgbakọ ndị mmadụ tikuo ha ka ha nyere m aka. 29Abụrụla m nwanne nkịta ọhịa;
onye ya na ikwighịkwighị na-esogharị. 30Akpụkpọ ahụ m na-eji nji na-ekpe iwere;
anụ ahụ m na-anụ ọkụ dịka ihe a kwanyere ọkụ. 31Ụda ụbọ akwara m bụ ụda iru ụjụ;
ụda ọja m bụkwa ụda iti mkpu akwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.