Job 30:3
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha bụ ndị ike gwụrụ site nʼụkọ na agụụ, ha na-agagharị nʼala kpọrọ nkụ na-awagharịkwa nʼime ọzara nʼabalị.
Job 30:3 in English
Job 30:3 · Berean Standard Bible
Gaunt from poverty and hunger, they gnawed the dry land, and the desolate wasteland by night.
Context
1“Ma ugbu a, ha na-akwa m emo
bụ ndị bụ ụmụntakịrị nʼebe m nọ,
bụ ndị nna ha na-etorughị ndị m na-ezipụ
ka ha na nkịta na-eso atụrụ m nọkọta. 2Uru gịnị ka ike aka ha ga-abara m,
ebe ọ bụ na ha adịghịkwa ike? 3Ha bụ ndị ike gwụrụ site nʼụkọ na agụụ,
ha na-agagharị nʼala kpọrọ nkụ
na-awagharịkwa nʼime ọzara nʼabalị. 4Nʼala ọhịa ka ha na-atụrị ahịhịa nnu,
mgbọrọgwụ osisi brum bụkwa nri ha. 5A chụpụrụ ha site nʼetiti ndị mmadụ ibe ha,
a na-etiso ha mkpu dịka ha bụ ndị ohi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.