Job 30:5
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A chụpụrụ ha site nʼetiti ndị mmadụ ibe ha, a na-etiso ha mkpu dịka ha bụ ndị ohi.
Job 30:5 in English
Job 30:5 · Berean Standard Bible
They were banished from among men, shouted down like thieves,
Context
3Ha bụ ndị ike gwụrụ site nʼụkọ na agụụ,
ha na-agagharị nʼala kpọrọ nkụ
na-awagharịkwa nʼime ọzara nʼabalị. 4Nʼala ọhịa ka ha na-atụrị ahịhịa nnu,
mgbọrọgwụ osisi brum bụkwa nri ha. 5A chụpụrụ ha site nʼetiti ndị mmadụ ibe ha,
a na-etiso ha mkpu dịka ha bụ ndị ohi. 6A chụpụrụ ha ka ha gaa biri nʼala iyi mmiri na-adịghị.
Ha bi nʼetiti ọgba nkume na ọnụ a tụrụ nʼime ala. 7Ha na-eme ụzụ nʼọhịa dịka ụmụ anụmanụ,
na-ejikọta onwe ha nʼahịhịa toro nʼokpuru osisi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.