Job 30:4
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼala ọhịa ka ha na-atụrị ahịhịa nnu, mgbọrọgwụ osisi brum bụkwa nri ha.
Job 30:4 in English
Job 30:4 · Berean Standard Bible
They plucked mallow among the shrubs, and the roots of the broom tree were their food.*
Context
2Uru gịnị ka ike aka ha ga-abara m,
ebe ọ bụ na ha adịghịkwa ike? 3Ha bụ ndị ike gwụrụ site nʼụkọ na agụụ,
ha na-agagharị nʼala kpọrọ nkụ
na-awagharịkwa nʼime ọzara nʼabalị. 4Nʼala ọhịa ka ha na-atụrị ahịhịa nnu,
mgbọrọgwụ osisi brum bụkwa nri ha. 5A chụpụrụ ha site nʼetiti ndị mmadụ ibe ha,
a na-etiso ha mkpu dịka ha bụ ndị ohi. 6A chụpụrụ ha ka ha gaa biri nʼala iyi mmiri na-adịghị.
Ha bi nʼetiti ọgba nkume na ọnụ a tụrụ nʼime ala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.