Job 30:6
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A chụpụrụ ha ka ha gaa biri nʼala iyi mmiri na-adịghị. Ha bi nʼetiti ọgba nkume na ọnụ a tụrụ nʼime ala.
Job 30:6 in English
Job 30:6 · Berean Standard Bible
so that they lived on the slopes of the wadis, among the rocks and in holes in the ground.
Context
4Nʼala ọhịa ka ha na-atụrị ahịhịa nnu,
mgbọrọgwụ osisi brum bụkwa nri ha. 5A chụpụrụ ha site nʼetiti ndị mmadụ ibe ha,
a na-etiso ha mkpu dịka ha bụ ndị ohi. 6A chụpụrụ ha ka ha gaa biri nʼala iyi mmiri na-adịghị.
Ha bi nʼetiti ọgba nkume na ọnụ a tụrụ nʼime ala. 7Ha na-eme ụzụ nʼọhịa dịka ụmụ anụmanụ,
na-ejikọta onwe ha nʼahịhịa toro nʼokpuru osisi. 8Ha bụ ndị e ledara anya, ndị na-enweghị aha,
e sitere nʼala ahụ chụpụ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.