Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị: 2“Ọ gaara adị m nọọ mma ma a sị na m ga-adị dịka m dị nʼọnwa ole na ole gara aga,
dịka ụbọchị ndị ahụ mgbe Chineke na-elekọta m, 3mgbe oriọna ya na-achakwasị m nʼisi
ìhè ya ka m ji jee ije nʼọchịchịrị. 4Ewoo, otu ihe dịịrị nʼụbọchị ihe na-agara m nke ọma,
mgbe mmekọrịta mụ na Chineke mere ka ụlọ m bụrụ ebe a gọziri agọzi, 5mgbe Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere m
na mgbe ụmụ m nọkwa m gburugburu, 6mgbe ụzọ m jupụtara na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ,
mgbe nkume na-awụpụtara m mmanụ oliv dịka mmiri na-asọ asọ. 7“Mgbe m na-apụ nʼọnụ ụzọ ama obodo
were ọnọdụ m nʼama. 8Ụmụ okorobịa na-ahụ m wezuga onwe ha,
ndị okenye na-ahụkwa m ma guzo nʼụkwụ ha; 9ndịisi ọchịchị obodo na-akwụsị ikwu okwu
ma were aka ha kpuchie ọnụ ha; 10olu ndị a na-asọpụrụ na-adakwa jụụ,
ire ha na-araparakwa ha nʼakpo ọnụ. 11Nʼoge ahụ, onye ọbụla nụrụ olu m na-ekwu ihe dị mma banyere m,
ndị hụkwara m na-agba ama ọma maka m. 12Nʼihi na anapụtara m ndị ogbenye na-eti mkpu enyemaka,
napụtakwa ndị mgbei na-enweghị ndị enyemaka. 13Onye nọ nʼọnụ ọnwụ gọziri m;
emekwara m ka obi nwanyị di ya nwụrụ bụọ abụ. 14Ana m eyikwasị ezi omume dịka uwe,
ikpe ziri ezi bụ uwe mwụda m na akwa okike nke isi m. 15Abụ m anya nye onye ìsì,
bụrụkwa ụkwụ nye onye ngwụrọ. 16Abụ m nna nke onye nọ na mkpa;
bụrụkwa onye gbalịrị ịhụ na ndị ọbịa natara ikpe ziri ezi. 17Etijiri m ikiri eze nke ndị ajọ omume,
si otu a napụta ndị ha na-achọ ịdọgbu. 18“Echere m sị, ‘Aga m anwụ nʼụlọ nke aka m,
na ụbọchị m ga-abakwa ụba dịka aja dị nʼala. 19Mgbọrọgwụ m ga-eto rịda na mmiri,
na igirigi ga-adakwasịkwa nʼalaka m abalị niile. 20Nsọpụrụ m ga-adịgide ọhụrụ nʼime m,
ụta m ga-adịgidekwa ọhụrụ nʼaka m.’ 21“Ụmụ mmadụ na-eji oke olileanya na-ege m ntị,
ha na-ederekwa duu ịnụrụ ndụmọdụ m. 22Mgbe m kwụsịrị okwu, ha anaghị ekwukwa ọzọ.
Okwu m na-ada juu na ntị ha. 23Ha na-echerekwa m dịka e si echere mmiri ozuzo,
na-aṅụkwa okwu m dịka ala si aṅụ mmiri ozuzo nʼọkọchị. 24Mgbe m miiri ha ọnụ ọchị, ha adịghị ekwenye ya;
ìhè nke ihu m dị oke mkpa nye ha. 25Ọ bụ m na-ahọpụtara ha ụzọ, na-anọdụ dịka onyeisi ha;
ebiri m dịka a ga-asị na m bụ onye eze nʼetiti ndị agha ya;
na dịka onye na-akasị ndị na-eru ụjụ obi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.