Job 29:13
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye nọ nʼọnụ ọnwụ gọziri m; emekwara m ka obi nwanyị di ya nwụrụ bụọ abụ.
Job 29:13 in English
Job 29:13 · Berean Standard Bible
The dying man blessed me, and I made the widow’s heart sing for joy.
Context
11Nʼoge ahụ, onye ọbụla nụrụ olu m na-ekwu ihe dị mma banyere m,
ndị hụkwara m na-agba ama ọma maka m. 12Nʼihi na anapụtara m ndị ogbenye na-eti mkpu enyemaka,
napụtakwa ndị mgbei na-enweghị ndị enyemaka. 13Onye nọ nʼọnụ ọnwụ gọziri m;
emekwara m ka obi nwanyị di ya nwụrụ bụọ abụ. 14Ana m eyikwasị ezi omume dịka uwe,
ikpe ziri ezi bụ uwe mwụda m na akwa okike nke isi m. 15Abụ m anya nye onye ìsì,
bụrụkwa ụkwụ nye onye ngwụrọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.