Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe m kwụsịrị okwu, ha anaghị ekwukwa ọzọ. Okwu m na-ada juu na ntị ha.

Job 29:22 in English

Job 29:22 · Berean Standard Bible

After my words, they spoke no more; my speech settled on them like dew.

Context

20Nsọpụrụ m ga-adịgide ọhụrụ nʼime m, ụta m ga-adịgidekwa ọhụrụ nʼaka m.’ 21“Ụmụ mmadụ na-eji oke olileanya na-ege m ntị, ha na-ederekwa duu ịnụrụ ndụmọdụ m. 22Mgbe m kwụsịrị okwu, ha anaghị ekwukwa ọzọ. Okwu m na-ada juu na ntị ha. 23Ha na-echerekwa m dịka e si echere mmiri ozuzo, na-aṅụkwa okwu m dịka ala si aṅụ mmiri ozuzo nʼọkọchị. 24Mgbe m miiri ha ọnụ ọchị, ha adịghị ekwenye ya; ìhè nke ihu m dị oke mkpa nye ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.