Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ m nna nke onye nọ na mkpa; bụrụkwa onye gbalịrị ịhụ na ndị ọbịa natara ikpe ziri ezi.

Job 29:16 in English

Job 29:16 · Berean Standard Bible

I was a father to the needy, and I took up the case of the stranger.

Context

14Ana m eyikwasị ezi omume dịka uwe, ikpe ziri ezi bụ uwe mwụda m na akwa okike nke isi m. 15Abụ m anya nye onye ìsì, bụrụkwa ụkwụ nye onye ngwụrọ. 16Abụ m nna nke onye nọ na mkpa; bụrụkwa onye gbalịrị ịhụ na ndị ọbịa natara ikpe ziri ezi. 17Etijiri m ikiri eze nke ndị ajọ omume, si otu a napụta ndị ha na-achọ ịdọgbu. 18“Echere m sị, ‘Aga m anwụ nʼụlọ nke aka m, na ụbọchị m ga-abakwa ụba dịka aja dị nʼala.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.