Job 29:16
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Abụ m nna nke onye nọ na mkpa; bụrụkwa onye gbalịrị ịhụ na ndị ọbịa natara ikpe ziri ezi.
Job 29:16 in English
Job 29:16 · Berean Standard Bible
I was a father to the needy, and I took up the case of the stranger.
Context
14Ana m eyikwasị ezi omume dịka uwe,
ikpe ziri ezi bụ uwe mwụda m na akwa okike nke isi m. 15Abụ m anya nye onye ìsì,
bụrụkwa ụkwụ nye onye ngwụrọ. 16Abụ m nna nke onye nọ na mkpa;
bụrụkwa onye gbalịrị ịhụ na ndị ọbịa natara ikpe ziri ezi. 17Etijiri m ikiri eze nke ndị ajọ omume,
si otu a napụta ndị ha na-achọ ịdọgbu. 18“Echere m sị, ‘Aga m anwụ nʼụlọ nke aka m,
na ụbọchị m ga-abakwa ụba dịka aja dị nʼala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.