Job 29:18
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Echere m sị, ‘Aga m anwụ nʼụlọ nke aka m, na ụbọchị m ga-abakwa ụba dịka aja dị nʼala.
Job 29:18 in English
Job 29:18 · Berean Standard Bible
So I thought: ‘I will die in my nest and multiply my days as the sand.
Context
16Abụ m nna nke onye nọ na mkpa;
bụrụkwa onye gbalịrị ịhụ na ndị ọbịa natara ikpe ziri ezi. 17Etijiri m ikiri eze nke ndị ajọ omume,
si otu a napụta ndị ha na-achọ ịdọgbu. 18“Echere m sị, ‘Aga m anwụ nʼụlọ nke aka m,
na ụbọchị m ga-abakwa ụba dịka aja dị nʼala. 19Mgbọrọgwụ m ga-eto rịda na mmiri,
na igirigi ga-adakwasịkwa nʼalaka m abalị niile. 20Nsọpụrụ m ga-adịgide ọhụrụ nʼime m,
ụta m ga-adịgidekwa ọhụrụ nʼaka m.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.