Job 29:5
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
mgbe Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere m na mgbe ụmụ m nọkwa m gburugburu,
Job 29:5 in English
Job 29:5 · Berean Standard Bible
when the Almighty was still with me and my children were around me,
Context
3mgbe oriọna ya na-achakwasị m nʼisi
ìhè ya ka m ji jee ije nʼọchịchịrị. 4Ewoo, otu ihe dịịrị nʼụbọchị ihe na-agara m nke ọma,
mgbe mmekọrịta mụ na Chineke mere ka ụlọ m bụrụ ebe a gọziri agọzi, 5mgbe Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere m
na mgbe ụmụ m nọkwa m gburugburu, 6mgbe ụzọ m jupụtara na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ,
mgbe nkume na-awụpụtara m mmanụ oliv dịka mmiri na-asọ asọ. 7“Mgbe m na-apụ nʼọnụ ụzọ ama obodo
were ọnọdụ m nʼama.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.