Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ na-atụba m nʼime apịtị, mee ka m ghọọ ntụ na aja.

Job 30:19 in English

Job 30:19 · Berean Standard Bible

He throws me into the mud, and I have become like dust and ashes.

Context

17Abalị na-esewasị ọkpụkpụ m, ihe mgbu m nke na-ata ata enweghị ezumike. 18Nʼoke ike ya, Chineke na-adịrị m ka uwe; ọ na-ekechi m dịka olu uwe m. 19Ọ na-atụba m nʼime apịtị, mee ka m ghọọ ntụ na aja. 20“Chineke m, anam etiku gị ma ị dịghị aza m; anam eguzo ọtọ, ma naanị anya ka i lere m. 21Ị na-emegide m na-enweghị obi ebere; i ji aka gị dị ike megide m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.